Mark 5:42 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Otu mgbe ahụ nwanta ahụ biliri ọtọ bido na-ejegharị nꞌime ụlọ ahụ. Ọṅụ jupụtara obi nne na nna ya.
Igbo 2006
Ngwa ngwa nwa-ab͕ọghọ ntà ahu we bilie, jeghari kwa; n'ihi na ọ b͕ara arọ iri na abua. Ngwa ngwa ibobo we nwubiga ha nile ókè n'aru
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu mgbe ahụ nwaagbọghọ nta ahụ biliri ọtọ bido ijegharị (ọ gbara afọ iri na abụọ). Nke a jụrụ ha niile anya nke ukwuu.