Mark 6:11 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Obodo ọ bụla ndị bi nꞌime ya juru ịnabata unu, ma ọ bụ nke ndị bi nꞌime ya jụrụ ige unu ntị, sitenụ nꞌime ya pụọ. Mgbe unu na-ahapụ obodo ahụ kụchapụnụ aja dị nꞌụkwụ unu nꞌọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ. Nke a ga-abụ ihe ama igosi na ha jụrụ Chineke na ozi ya.”
Igbo 2006
Ma ebe ọ bula nke nānaraghi unu nke-ọma, ebe ha anughi kwa okwu-unu, mb͕e unu nāpu n'ebe ahu, tichapu ájá di n'okpuru ukwu-unu ka ọ buru ha àmà.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ bụrụ na obodo ọbụla anabataghị unu maọbụ egeghị unu ntị, kụchapụnụ aja dị nʼụkwụ unu mgbe unu na-apụ, ka ọ bụrụ ihe ama megide ha.”