Mark 6:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ dịghị anya eze Herọd nụrụ akụkọ banyere Jisọs, nꞌihi na nꞌoge a ndị mmadụ nọ ebe nile na-ekwu okwu banyere ọrụ ebube ọ na-arụ. Ụfọdụ mmadụ sịrị, “Jisọs bụ Jọn omee baptizim. O sitela nꞌọnwụ dịrị ndụ ọzọ. Ọ bụ nke a mere o ji arụ ọrụ ịtụnanya ndị a nile ọ na-arụ.”
Igbo 2006
Herod, bú eze, we nu, n'ihi na aha-Ya putara ìhè: o we si, Jọn onye nēme baptism, emewo ka o si na ndi nwuru anwu bilie, n'ihi nke à ka ike ndia nālusi ọlu ike na Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Eze Herọd nụrụ akụkọ banyere ya, nʼihi na aha Jisọs aghọọla okwu a kpụ nʼọnụ. Ụfọdụ na-asị, na ọ bụ “Jọn omee baptizim; na e meela ka o site na ndị nwụrụ anwụ bilie. Ọ bụkwa nke a mere ka ike ọrụ ebube ji dị nʼime ya.”