Mark 6:17 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụ Herọd nꞌonwe ya nyere iwu ka e jide Jọn. Ọ bụ ya nyere iwu ka e kee ya agbụ tinye ya nꞌụlọ mkpọrọ. Herọd mere nke a nꞌihi Herodịas nwụnye ọ lụrụ. Herodịas bụrị nwụnye Filip nwanne Herọd tupuu Herọd emegharịa ya anya, gwa ya ka ọ hapụ Filip ka ya onwe ya, bụ Herọd, lụwa ya.
Igbo 2006
N'ihi na Herod onwe-ya zipururi jide Jọn, we ke ya ab͕u n'ulo-nkpọrọ n'ihi Herodias, nwunye Filip nwa-nna-ya: n'ihi na ọ luru ya na nwunye.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na Herọd nʼonwe ya nyererị iwu ka e jide Jọn kee ya agbụ tụba ya nʼụlọ mkpọrọ. O mere nke a nʼihi Herodịas bụrịị nwunye Filip nwanne ya, onye ọ kpọrọ dịka nwunye ya.