Mark 6:2 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌụbọchị izuike, ọ banyere nꞌụlọ ekpere ndị Juu dị nꞌebe ahụ, bido ikwu okwu Chineke. Ọtụtụ ndị gere ya ntị ka o juru anya bụ okwu si ya nꞌọnụ na-apụta. Ha jụrụ sị, “Ebee ka nwoke a nọrọ mụọ ihe ndị a nile? Ònye nyere ya amamihe a? Ebee ka o siri nweta ike ịrụ ọrụ ịrịba ama ndị a nile?
Igbo 2006
Mb͕e ubọchi-izu-ike ruru, O we malite izi ihe n'ulo-nzukọ-ha: mb͕e ha nuru Ya ibobo we nwua ọra madu n'aru, ha si, Òle ebe ka Nwoke a nwere ihe ndia? ha si kwa, Gini bu amam-ihe enyere Nwoke a? òle isi ọlu ike di otú a aluru n'aka-Ya?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼụbọchị izuike, ọ banyere nʼụlọ ekpere bido izi ihe. Ozizi ya juru ọtụtụ ndị gere ya ntị anya. Ha kwuru sị, “Ebee ka nwoke si mụta ihe ndị a niile? Gịnịkwa bụ amamihe nke a e nyere ya? Lekwa ọrụ ebube nke a ọ rụrụ?