Mark 6:20 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na Herọd tụrụ egwu Jọn. Ọ maara na Jọn bụ ezi mmadụ, na onye dị nsọ. Nꞌihi nke a o tinyere ya nꞌụlọ mkpọrọ ichebe ndụ ya. Site nꞌoge ruo nꞌoge, Herọd na-akpọpụta Jọn ka ya na ya kparịa ụka. Ma ọ bụ ezie na Herọd adịghị enwe obi udo mgbe ọ bụla ya na Jọn kaparịtara ụka, ma ọ na-atọkwa Herọd ụtọ ịna anụ ihe Jọn na-ekwu.
Igbo 2006
n'ihi na Herod nātu egwu Jọn, ebe ọ matara na ọ bu nwoke nke bu onye ezi omume na onye di nsọ, ọ nēdebe kwa ya nke-ọma. Ọzọ, mb͕e ọ nuru okwu-ya, ọ nēchè uche nke-uku; o were kwa obi-utọ nānu ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
nʼihi na Herọd na-atụ egwu ma na-echekwa Jọn, ebe ọ maara na ọ bụ onye ezi omume na onye dị nsọ. Mgbe ọ nụrụ okwu ya, o nweghị udo nʼobi ma ige ya ntị na-amasị ya.