Mark 6:21 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Otu ụbọchị, Herodịas nwetara ihe ọ na-achọ. Nꞌụbọchị ncheta ọmụmụ Herọd, ọ kpọrọ oriri. Ọ kpọrọ ndị a maara aha ha nọ nꞌobi eze, na ndị ọchịagha ya, na ndị mmadụ dị mkpa bi na Galili ka ha bịa nꞌoriri ahụ.
Igbo 2006
Ma mb͕e ubọchi di oghere ruru, mb͕e Herod siri nri-anyasi na ncheta-ọmumu-ya nye ndi-amadi-ya, na ndi-ọchi-agha, na ndi-isi nke Galili;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼikpeazụ, ohere bịara mgbe Herọd kpọrọ oriri nʼụbọchị ncheta ọmụmụ ya nye ndị ọkwa ha dị elu nʼokpuru ọchịchị ya, ndịisi ndị ọchịagha na ndị bụ ndị ndu nʼobodo Galili.