Mark 6:22 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌoge oriri ahụ, ada Herọd, nke Herodịas mụtara, pụtara tee egwu nꞌihu Herọd na nꞌihu ndị ọbịa ya. Obi tọrọ ndị nọ nꞌebe ahụ ụtọ nꞌihu egwu o tere.
Igbo 2006
mb͕e nwa-nwanyi Herodias onwe-ya bata-kwa-ra, te egwú, o we tọ ha utọ, bú Herod na ndi ya na ha nānọdu na nri; eze we si nwa-ab͕ọghọ ntà ahu, Riọm ihe ọ bula i nāchọ, na m'gēnye gi ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ada Herodịas bịara tee egwu, obi tọrọ Herọd na ndị niile ọ kpọrọ oriri ụtọ. Eze gwara nwaagbọghọ ahụ sị, “Rịọ m ihe ọbụla ị chọrọ aga m enyekwa gị ya.”