Mark 6:25 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nne ya zara ya sị, “Laghachi azụ rịọ ya ka o nye gị isi Jọn omee baptizim ahụ!” Ngwangwa nwanta nwanyị ahụ laghachiri gwa Herọd nna ya sị, “Achọrọ m ka i nye m, ugbu a, nꞌime efere, isi Jọn omee baptizim.”
Igbo 2006
O were ọsọ bata ngwa ngwa n'ebe eze ahu nọ, we riọ, si, Anamachọ ka i nyem isi Jọn Baptist n'ọkwa ub͕u a.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ngwangwa, ọ bịakwutere eze rịọ ya sị, “Achọrọ m ka i nye m, ugbu a, nʼime efere, isi Jọn omee baptizim.”