Mark 6:34 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe Jisọs sitere nꞌụgbọ mmiri wụdata, ọ hụrụ ọtụtụ ndị mmadụ a ka ha zukọrọ. O nwere ọmiko nꞌebe ha nọ, nꞌihi na ha dị ka ụmụ ọkụkọ na-enweghị nne. O bidokwara izi ha ihe mgbe ahụ.
Igbo 2006
O we puta, hu oké ìgwé madu, O we nwe ọmiko n'aru ha, n'ihi na ha di ka aturu nēnweghi onye nāzù ha: O we malite izí ha ọtutu ihe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe o sitere nʼụgbọ mmiri rịdata, ọ hụrụ oke igwe mmadụ a ka ha zukọrọ. O nwere ọmịiko nʼebe ha nọ, nʼihi na ha dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha. Ọ malitekwara izi ha ọtụtụ ihe.