Mark 6:41 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs naara ogbe beredi ise na azụ abụọ ndị a welie anya ya elu kpee ekpere gọzie ha. Ọ nyawara beredi ahụ nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahụ. Otu a kwa ọ nyawakwara azụ abụọ ahụ nyekwa ha nile.
Igbo 2006
O we nara ob͕e achicha ise na azù abua ahu, le anya n'elu-igwe, gọzie ha, nyawa ob͕e achicha ahu; O we nēnye ndi nēso uzọ-Ya ka ha debe ha n'iru ndi ahu; O we kère ha nile azù abua ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ naara ogbe achịcha ise na azụ abụọ ndị ahụ, welie anya ya elu, nye ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahụ. Otu aka ahụkwa ọ nyawakwara azụ abụọ ahụ nyekwa ha niile.