Mark 6:45 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Emesịa, na-atụfughị oge, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha banye nꞌụgbọ mmiri bido ịga Betsaida. Ya onwe ya nọdụrụ chere izilaga ndị mmadụ ahụ.
Igbo 2006
Ngwa ngwa o we rugide ndi nēso uzọ-Ya ka ha ba n'ub͕ọ-ha, buru Ya uzọ gabiga n'ofè ọzọ na Betsaida, mb͕e Ya onwe-ya nēzilaga ìgwè madu ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ngwangwa, o mere ka ndị na-eso ụzọ ya banye nʼụgbọ mmiri buru ya ụzọ gafee nʼofe nke ọzọ nke osimiri Betsaida, ebe ya onwe ya nọdụrụ izilaga igwe mmadụ ahụ.