Mark 6:48 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Site nꞌebe ọ nọ nꞌelu ala, Jisọs hụrụ ka ndị na-eso ụzọ ya na ebili mmiri na-agba mgba. Ọ hụrụ na ndị na-eso ụzọ ya nọ na nsogbu, hụkwa na ikuku na-efe nꞌụzọ na-emegide ha. Nꞌihe dị ka elekere atọ nke ụtụtụ, o bidoro ịga ije nꞌelu mmiri ịbịakwute ndị na-eso ụzọ ya. Emesịa, o rutere ebe ha nọ, mee dị ka ọ chọrọ ịgafe ha.
Igbo 2006
Mb͕e Ọ huru ha ka ha nādọb͕u onwe-ha n'ọnyinya-ub͕o-ha, n'ihi na ifufe nēfegide ha, O we biakute ha dika nche nke-anọ n'abali, nēje ije n'elu oké osimiri; O we chọ igabiga ha:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọ hụrụ na ha nọ na nsogbu nʼihi na ikuku na-emegide ha, nʼihe dị ka elekere atọ nke ụtụtụ, o bidoro ịga ije nʼelu mmiri ịbịakwute ha, ma o mere dị ka ọ chọrọ ịgafe ha.