Mark 7:24 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs hapụrụ ebe ahụ gaa akụkụ obodo Taịa. Nꞌebe ahụ ọ banyere nꞌime otu ụlọ. Ọ chọkwaghị ka ndị mmadụ mata na ọ nọ nꞌebe ahụ. Ma o nweghị ike zoo onwe ya. Ọtụtụ mmadụ chọpụtara ya, kọsaa akụkọ na ọ nọ nꞌebe ahụ.
Igbo 2006
O we si n'ebe ahu bilie, je n'ókè-ala Taia na Saidon. O we ba n'ulo, Ọ chọghi kwa ka onye ọ bula mara: ma apughi izota Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ hapụrụ ebe ahụ gaa nʼakụkụ obodo Taịa. Nʼebe ahụ ọ banyere nʼime otu ụlọ. Ma o nwekwaghị ike izo onwe ya, nʼagbanyeghị na ọ chọghị ka a mata na ọ nọ ebe ahụ.