Mark 7:25 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ dịghị anya otu nwanyị bịakwutere ya. Nwanyị a nwere otu nwa nwanyị ntakịrị onye mmụọ ọjọọ na-esogbu. Ọ nụla akụkọ banyere ọrụ Jisọs na-arụ, ya mere, ọ bịakwutere ya daa nꞌala nꞌụkwụ ya.
Igbo 2006
Ma ngwa ngwa otù nwanyi, nke nwa-ya nwanyi nke-ntà nwere mọ nādighi ọcha, ebe ọ nuru ùdé-Ya, ọ bia da n'ala n'ukwu-Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ngwangwa, otu nwanyị nwere otu nwa nwanyị ntakịrị nke mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya nụrụ maka ya, ọ bịara daa nʼụkwụ ya.