Mark 7:26 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ rịọrọ Jisọs ka ọ chụpụrụ ya mmụọ ọjọọ bị nꞌime nwa ya nwanyị. (Nwanyị a bụ onye obodo Siria Fonisia. Ọ bụkwa onye mba ọzọ e ledara anya.)
Igbo 2006
Ma nwanyi ahu bu onye-Grik, buru onye Sairo-Finisia n'ọmumu-ya. O we kpere Ya ka Ọ chupu mọ ọjọ ahu n'aru nwa-ya nwanyi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nwanyị a bụ onye Griik a mụrụ nʼakụkụ Sairo-Fonisia. Ọ rịọrọ ya ka ọ chụpụrụ ya mmụọ ọjọọ ahụ bi nʼime nwa ya nwanyị.