Mark 7:3 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụ omenala ndị Juu, nke ka nke ndị Farisii, na tupuu mmadụ erie ihe, ọ ga-ebu ụzọ kwọọ aka ya. Omenala a bidororị nꞌoge dị anya.
Igbo 2006
N'ihi na ndi-Farisi, na ndi-Ju nile, ọ buru na ha akwọchaghi aka-ha, ha adighi-eri ihe, n'ihi na ha nējide ozizí nke ndi-okenye nyere ha n'aka idebe:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị Farisii na ndị Juu niile adịghị eri nri ma ọ bụrụ na ha akwọghị aka, nʼihi na ha na-ejigidesi aka ike nʼozizi na omenaala nke ndị okenye.