Mark 7:33 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs duuru nwoke ahụ pụọ nꞌebe igwe mmadụ ahụ nọ, ebe ha abụọ nọpụrụ iche. Nꞌebe ahụ Jisọs rụnyere nwoke ahụ mkpịsị aka nꞌime ntị ya abụọ. Jisọs gbụpụkwara ọnụ mmiri, metụkwa nwoke ahụ aka nꞌire.
Igbo 2006
O we si n'igwè madu ahu kupu ya iche, we tiye nkpisi-aka-Ya na nti-ya abua, bu kwa ọnu-miri, metu ire-ya;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O duuru ya pụọ nʼebe igwe mmadụ ahụ nọ, rụnye ya mkpịsịaka nʼime ntị ya abụọ. Mgbe ahụ ọ gbụpụkwara ọnụ mmiri metụkwa ya aka nʼire.