Mark 7:4 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụrụ na ndị Juu esite nꞌahịa lọta, ha agaghị eri ihe ọ bụla tutuu ha akwọọ aka ha. Ọ dịkwa omenala ọzọ dị iche iche ha nwere dị ka omenala ịsacha iko, ma ọ bụ ịsacha ite na efere.
Igbo 2006
ọzọ, mb͕e ha si n'ahia lata, ọ buru na ha efesaghi onwe-ha miri, ha adighi-eri ihe: ọtutu ihe ọzọ di kwa, nke ha natara ijide, dika ime iko, na ite, na ihe ọla, baptism.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọbụla ha si nʼahịa lọta, ha adịghị eri nri ma ọ bụghị ma ha sachara onwe ha. Ha na-edebekwa ọtụtụ omenaala ndị ọzọ dị ka ịsacha iko, na ite mmiri na ketụlụ.