Mark 7:6 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs zara sị ha, “Okwu ahụ Aịzaya kwuru banyere unu ndị ihu abụọ bụ eziokwu. Nꞌihi na Aịzaya buru amụma sị, ‘Ndị a ji ire dị ụtọ na-ekwu okwu banyere m, ma nꞌime obi ha, ha ahụghị m nꞌanya.
Igbo 2006
Ma Ọ siri ha, Aisaia buru amuma nke-ọma n'isi unu ndi-iru-abua, dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ndi nka nāsọpurum n'eb͕ub͕ere-ọnu-ha, Ma obi-ha di anya n'ebe M'nọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ sịrị ha, “Amụma ahụ Aịzaya buru banyere unu ndị ihu abụọ bụ eziokwu; dị ka e dere ya sị, “ ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya nʼebe m nọ.