Mark 8:11 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe Jisọs ruru nꞌebe ahụ, ndị Farisii bịakwutere ya bido ịjụ ya ajụjụ. Ha gwara Jisọs okwu sị ya, “Ị bụrụ ihe ahụ ị sị na ị bụ, mee ka ihe dị egwu mee na mbara eluigwe. Mgbe ahụ anyị ga-ekwere na ị bụ onye ahụ.”
Igbo 2006
Ndi-Farisi we puta, malite iju Ya ajuju, nāchọ ihe-iriba-ama n'aka-Ya site n'elu-igwe, n'inwa Ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ndị Farisii bịakwutere ya malite nrụrịta ụka, na-achọ ihe ịrịbama si nʼeluigwe, iji nwalee ya.