Mark 8:12 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe Jisọs nụrụ ihe ha chọrọ ka o mee, ọ sụrụ ude nke ukwuu nꞌime onwe ya sị ha, “Gịnị mere ndị ọgbọ a ji na-arịọ m ka m gosi ha ihe ịrịba ama tupu ha ekwere na m? Ka m gwa unu eziokwu, ọ dịghị ihe ịrịba ama a ga-egosi unu.”
Igbo 2006
O we sua udè nke-uku na mọ-Ya, si, Gini mere ọb͕ọ a nāchọ ihe-iriba-ama? n'ezie asim unu, Agaghi-enye ọb͕ọ a ihe-iriba-ama.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ sụrụ ude nke ukwuu nʼime onwe ya sị, “Gịnị mere ọgbọ a ji achọ ihe ịrịbama? Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, o nweghị ihe ịrịbama a ga-egosi ọgbọ a.”