Mark 8:15 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe ha nọ na-eche ihe banyere ya, Jisọs sịrị ha, “Ka m dọọ unu aka na ntị, kpacharanụ anya. Unu ekwela ka e jiri ihe na-eko achịcha ndị Farisii na nke ndị otu Herọd duhie unu.”
Igbo 2006
O we gwasie ha ike, si, Nēlenu anya, lezienu anya ihe ndi-Farisi, bú ihe nēko achicha, na ihe Herod, bú ihe nēko achicha.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ dọrọ ha aka na ntị sị, “Kpacharanụ anya. Lepụnụ anya maka ihe na-eko achịcha ndị Farisii na nke Herọd.”