Mark 8:18 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ùnu nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ? Ùnu nwere ntị nke na-ajụ ịnụ ihe? Ọ̀ ga-abụ na unu echefuola ngwangwa otu a?
Igbo 2006
Unu ahughi uzọ mb͕e unu nwere anya? ùnu anughi kwa ihe mb͕e unu nwere nti? ùnu echetaghi kwa?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ? Unu nwere ntị ma unu adịghị anụ ihe? Ọ ga-abụ na unu adịghị echeta?