Mark 8:31 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Emesịa, Jisọs bidoro ịgwa ndị na-eso ụzọ ya ihe banyere otu ọ ga-esi hụọ ahụhụ, na otu ndị okenye, na ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu ga-esi jụ ya. Ọ gwara ha ihe banyere otu ha ga-esi gbuo ya, na otu ọ ga-esi site nꞌọnwụ bilie nꞌụbọchị nke atọ.
Igbo 2006
O we malite izí ha, na Nwa nke madu aghaghi ihu ọtutu ahuhu, na ndi-okenye na ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ aghaghi kwa iju Ya, na aghaghi ib͕u Ya, na Ọ ghaghi kwa isi n'ọnwu bilie mb͕e ubọchi atọ gasiri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Emesịa, o bidoro izi ha ihe na Nwa nke Mmadụ aghaghị ịhụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche, ndị okenye, na ndịisi nchụaja na ndị ozizi iwu ga-ajụ ya, na aghaghị igbu ya, ma ọ ga-ebili nʼọnwụ mgbe ụbọchị nke atọ gasịrị.