Mark 8:6 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs nyere iwu ka igwe mmadụ ahụ nọdụ ala. O weere ogbe beredi ahụ kpee ekpere nye Chineke ekele. Ọ nyawara beredi ahụ ntakịrị ntakịrị, nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahụ nile. Ndị na-eso ụzọ ya kekwara ya.
Igbo 2006
O we gwa ìgwè madu ahu ka ha nọdu ala: O we nara ob͕e achicha asa ahu; mb͕e O kelesiri ekele, Ọ nyawa ha, we nēnye ndi nēso uzọ-Ya, ka ha debe n'iru ha; ha we debe ha n'iru ìgwè madu ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala. O weere ogbe achịcha asaa ahụ kpee ekpere. Ọ nyawasịrị ha, nye ha ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee igwe mmadụ ahụ niile. Ha kekwara ya nye igwe mmadụ ahụ.