Mark 9:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Emesịa, Jisọs gwara ha sị, “Eziokwu ka m na-agwa unu, mgbe m na-asị, na e nwere ụfọdụ nꞌime ndị guzo nꞌebe a, ugbu a, ndị na-agaghị anwụ, tutuu ha ahụ ka alaeze Chineke ji ike bịa.”
Igbo 2006
O we si ha, N'ezie asim unu, Na n'etiti ndi guzoro nso ufọdu di n'ebe a, ndi nāgaghi-edetu ọnwu ire ma-ọli, rue mb͕e ha gāhu ala-eze Chineke ka ọ biaworo n'ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ gwara ha sị, “Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe a, agaghị edetụ ọnwụ ire tupu ha ahụ alaeze Chineke mgbe ọ ga-abịa nʼike.”