Mark 9:12 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs zara sị ha, “Nꞌezie, Ịlaịja kwesịrị ibu ụzọ bịa idozi ihe nile. Ma nꞌuche unu, gịnị mere ndị amụma jiri dee na Nwa nke mmadụ ga-ahụ ahụhụ, bụrụkwa onye a jụrụ ajụ?
Igbo 2006
O we si ha, Ọ bu ezie na Elaija bu uzọ bia, nēme kwa ka ihe nile di ka ha di na mbu: èsiwo kwa aṅa ede okwu a bayere Nwa nke madu n'akwukwọ nsọ, na Ọ gāhu ọtutu ahuhu, eme kwa Ya ihe-efu?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ gwara ha sị, “Ọ bụ ezie, Ịlaịja ga-ebu ụzọ bịa, na-emekwa ka ihe dị ka ọ dị na mbụ. Ma gịnị mere e jiri dee na Nwa nke Mmadụ ga-ahụ ọtụtụ ahụhụ, bụrụkwa onye a jụrụ ajụ?