Mark 9:17 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Otu onye nꞌime igwe mmadụ ahụ zara ya sị, “Onye ozizi, akpọtaara m gị nwa m nwoke a ka ị gwọọ ya. Mmụọ ọjọọ na-esogbu ya. O mekwara ka ọ daa ogbi.
Igbo 2006
Otù nwoke we si n'ìgwè madu ahu za Ya, si, Onye-ozizi, ekutaram I nwam nwoke, nke nwere mọ nādighi-ekwu okwu;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu onye nʼime igwe mmadụ ahụ zara ya sị, “Onye ozizi akpọtaara m gị nwa m nwoke, nke mmụọ ọjọọ bi nʼime ya, nke mekwara ka ọ daa ogbi.