Mark 9:18 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Mgbe ọ bụla mmụọ ọjọọ ahụ malitere isogbu ya, ọ na-atụda ya nꞌala. Mgbe ahụ ọ na-agbọ ụfụfụ nꞌọnụ ya, na-ata ikikiri eze. Anụ ahụ ya na-adị sisiriri dị ka onye nwụrụ anwụ. Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ mmụọ ọjọọ a, ma ha enweghị ike.”
Igbo 2006
ebe ọ bula o jidere ya, o we tie ya n'ala: ọ nāsu kwa ufufu n'ọnu, nāta kwa ikekere-ezé, nāta kwa aru: m'we gwa ndi nēso uzọ-Gi ka ha chupu ya; ma ba enweghi ike.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọbụla mmụọ ọjọọ ahụ malitere isogbu ya, ọ na-atụda ya nʼala. Mgbe ahụ, ọ na-agbọ ụfụfụ nʼọnụ ya, na-ata ikikere eze, anụ ahụ ya na-esikwa ike. Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ mmụọ ọjọọ a, ma ha enweghị ike.”