Mark 9:19 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Jisọs sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Lee ka okwukwe unu si dị nta! Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ tupuu unu ekwere? Ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-edi ekweghị ekwe unu? Kpọtara m nwanta nwoke ahụ!”
Igbo 2006
O we za ha, si, Unu ọb͕ọ nēnweghi okwukwe, rùe ole mb͕e ka Mu na unu gānọ? rùe ole mb͕e ka M'gānagide unu? unu kutaram ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ zaghachiri ha sị, “Unu ọgbọ na-enweghị okwukwe. Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anagide unu? Kpọtaranụ m ya!”