Mark 9:20 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ha kpọtaara ya nwanta ahụ. Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ hụrụ Jisọs, o nugharịrị nwanta ahụ nke ukwuu. Nwanta ahụ dara nꞌala na-atụrụ onwe ya nꞌala, na-agbọkwa ụfụfụ nꞌọnụ ya.
Igbo 2006
Ha we kuru ya biakute Ya: mb͕e ọ huru Ya, ngwa ngwa mọ ahu we sesie ya ike; o we da n'ala, nāturu, nāsu kwa ufufu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ha kpọtaara ya nwata ahụ. Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ hụrụ ya, ngwangwa, o nugharịrị nwata ahụ nke ukwuu, ọ daa nʼala na-atụrụ onwe ya nʼala, na-agbọkwa ụfụfụ nʼọnụ ya.