Mark 9:25 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Mgbe Jisọs hụrụ na igwe mmadụ ahụ na-agba ọsọ na-abịa nꞌebe ọ nọ, ọ baara mmụọ ọjọọ ahụ mba sị ya, “Gị mmụọ ọjọọ ntị ike na ịda ogbi, ana m enye gị iwu, site nꞌime nwanta a pụta! Abanyekwala nꞌime ya ọzọ!”
Igbo 2006
Ma mb͕e Jisus huru na ìgwè madu nāb͕akọta, Ọ bara mọ ahu nādighi ọcha nba, si ya, Gi mọ nādighi-ekwu okwu na nke nti chiri, Mu onwem nēnye gi iwu, si nime ya puta, abà-kwa-la nime ya ọzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe Jisọs hụrụ na igwe mmadụ na-agba ọsọ na-abịa nʼebe ahụ, ọ baara mmụọ ahụ na-adịghị ọcha mba sị, “Gị mmụọ ọjọọ ntị ike na ịda ogbi, ana m enye gị iwu, site nʼime nwata a pụta! Abanyekwala nʼime ya ọzọ!”