Mark 9:31 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
nꞌihi na o ji oge ahụ na-ezi ndị na-eso ụzọ ya ihe. Ọ gwara ha sị, “A ga-arara Nwa nke mmadụ nye nꞌaka ndị ga-egbu ya, ha ga-egbukwa ya. Ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ọ ga-esite nꞌọnwụ bilie.”
Igbo 2006
N'ihi na Ọ nēzí ndi nēso uzọ-Ya ihe, si ha, Anārara Nwa nke madu nye n'aka madu, ha gēb͕u kwa Ya; mb͕e eb͕usiri Ya, Ọ gēsi n'ọnwu bilie mb͕e ubọchi atọ gasiri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
nʼihi na ọ na-ezi ndị na-eso ụzọ ya ihe. Ọ sịrị ha, “A ga-arara Nwa nke Mmadụ nye nʼaka ụmụ mmadụ, ha ga-egbukwa ya ma ọ ga-ebili nʼọnwụ mgbe mkpụrụ ụbọchị atọ gasịrị.”