Mark 9:35 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs nọdụrụ ala kpọọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya ka ha bịa nọdụ ya gburugburu. Mgbe ha nọdụsịrị ala, ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụrụ na onye ọ bụla nꞌime unu achọọ ịbụ onye ka ibe ya ukwuu, onye ahụ ga-eburu ụzọ bụrụ onye dịkarịsịrị nta, na onye na-ejere ibe ya ozi.”
Igbo 2006
Ọ we nọdu ala, kpọ ndi-ozi iri na abua ahu; O we si ha, Ọ buru na onye ọ bula nācho ka ọ buru onye-isi, ọ gābu onye-ikpe-azu n'etiti unu nile, na onye nējere unu nile ozi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ nọdụrụ ala kpọọ mmadụ iri na abụọ ahụ, sị ha, “Ọ bụrụ na onye ọbụla chọrọ ịbụ onye mbụ, ọ ghaghị ịbụ onye ikpeazụ, bụrụkwa onye na-ejere mmadụ niile ozi.”