Mark 9:42 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Ọ bụrụkwa na onye ọ bụla emee ka otu nꞌime ndị a dị nta kweere na m, mehie, ọ ga-akara onye ahụ mma ma ọ bụrụ na e kenyere nkume buru ibu nꞌolu ya, tụnye ya nꞌime osimiri, ebe mmiri ga-eri ya.
Igbo 2006
Ọzọ, onye ọ bula nke gēme otù nime ndi ntà ndia ndi kwerenu ka ọ ma n'ọnyà, ọ gāka ya nma ma ewere nkume-igwe-nri nke inyinya-ibu nādọkpughari kwuba ya n'olu, tubà ya n'oké osimiri.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Ọ bụrụkwa na onye ọbụla emee ka otu nʼime ndị a dị nta kweere na m jehie, ọ ga-akara onye ahụ mma ma ọ bụrụ na e kenyere nkume igwe nri buru ibu nʼolu ya, tụnye ya nʼime oke osimiri.