Mark 9:43 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Ọ bụrụ na aka gị emee ka i mehie, gbupụ ya. Ọ dịrị gị mma iji otu aka dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, karịa na ị ga-eji aka abụọ banye nꞌọkụ ala mmụọ, ebe ọkụ na-adịghị anyụ anyụ.
Igbo 2006
Ọzọ ọ buru na aka-gi eme gi ka i ma n'onyà, bipu ya: o di gi nma ibà na ndu n'ọlusi, kari inwe aka-gi abua ba n'ọku ala-mọ, n'ọku anyughi-anyu;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na aka gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya. Ọ ga-akara gị mma inwe ọrụsị baa na ndụ karịa inwe aka abụọ banye nʼọkụ ala mmụọ, ebe ọkụ ya na-adịghị anyụ anyụ;