Mark 9:47 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Ọ bụrụkwa na anya gị emee ka i mehie, ghụpụ ya tụfuo ya. Ọ dịrị gị mma na i ji otu anya dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi nꞌalaeze Chineke, karịa na i ga-enwe anya abụọ a tụba gị nꞌọkụ ala mmụọ, ebe a na-adịghị emenyụ ọkụ ahụ emenyụ.
Igbo 2006
Ọ buru kwa na anya-gi eme gi ka i ma n'ọnyà, tupu ya: ọ di gi nma ibà n'ala-eze Chineke nēnwe otù anya, kari inwe anya abua atubà gi n'ọku ala-mọ;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya. Ọ ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa nʼalaeze Chineke, karịa inwe anya abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ,