Mark 9:50 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
“Nnu bụ ihe dị mma. Ma ọ bụrụ na nnụ etufuo ụtọ ya, gịnị ka a ga-eji mee ka ọ dị ụtọ ọzọ? Ya mere, unu etufula ụtọ unu. Unu na ibe unu biri nꞌudo.”
Igbo 2006
Nnú di nma: ma ọ buru na nnú etufuwo utọ-ya, gini ka unu gēji me ya ka ọ di utọ? Nwenu nnú nime unu, unu na ibe-unu di kwa n'udo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nnu dị mma, ma ọ bụrụ na ọ dịghị atọkwa ụtọ, olee ka ị ga-esi mee ka ọ tọọ ụtọ ọzọ? Ya mere, nweenụ nnu nʼime onwe unu. Unu na ibe unu biri nʼudo.”