Matthew 1:17 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ya mere, site nꞌEberaham ruo na Devidi e nwere ụgbọ iri na anọ. Ma site nꞌoge Devidi ruo mgbe e mere ka ha gaa biri nꞌala Babilọn, e nwere ọgbọ iri na anọ. Sitekwanụ nꞌoge ahụ ruo mgbe a mụrụ Jisọs bụkwa ọgbọ iri na anọ.
Igbo 2006
Ya mere ọb͕ọ nile site n'Abraham rue Devid di ọb͕ọ iri na anọ; site na Devid rue mb͕e emere ka ha je biri na Babilon di kwa ọb͕ọ iri na anọ; site na mb͕e emere ka ha je biri na Babilon rue Kraist di kwa ọb͕ọ iri na anọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, site nʼEbraham ruo na Devid, e nwere ọgbọ iri na anọ. Ma site nʼoge Devid ruo mgbe a dọọrọ ha nʼagha gaa Babilọn, e nwere ọgbọ iri na anọ. Sitekwanụ nʼoge ahụ ruo mgbe a mụrụ Kraịst bụkwa ọgbọ iri na anọ.