Matthew 1:18 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Banyere ọmụmụ Jisos onye nzọpụta, Chineke mere ka Meri nne ya bụ nwagbọghọ na-amaghị nwoke dịrị ime site nꞌike Mmụọ Nsọ, mgbe otu nwoke a na-akpọ Josef na-achọ ịlụ ya.
Igbo 2006
Ma ọmumu Jisus Kraist di otú a: Mb͕e ekwereri na Josef gālu nne-Ya Meri, mb͕e ha akēdinakọtaghi, ahuru na ọ di ime site na Mọ Nsọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Otu a ka ọmụmụ Jisọs, onye a na-akpọ Kraịst siri dị: Nne ya Meri bụ onye e kwenyere na ọ ga-alụ Josef, ma tupu ha ebikọọ ọnụ a chọpụtara na Meri di ime site na Mmụọ Nsọ.