Matthew 1:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma nwoke a na-achọ ịlụ Meri bụ ezi mmadụ. Nꞌihi ya, mgbe ọ chọpụtara na Meri dị ime, o zubere ịhapụ ya na nzuzo, nꞌihi na ọ chọghị ka ndị mmadụ mata ihe bụ ọnọdụ Meri.
Igbo 2006
Ma Josef di-ya, ebe ọ bu onye ezi omume, ma ọ chọghi igosi ya n'iru ọra, o zubere irapu ya na nzuzo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma Josef di ya bụ onye ezi omume, ọ chọghị imenye ya ihere, nʼihi ya, o zubere ịchụ ya na nzuzo.