Matthew 1:23 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
‘Lee, nwagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, ọ ga-amụkwa nwa nwoke. A ga-akpọ aha ya Ịmanụelụ, nke bụ ma asụgharịa ya, Chineke nọnyeere anyị.’ ”
Igbo 2006
Le, nwa-ab͕ọghọ ahu nāmaghi nwoke gādi ime, ọ gāmuta kwa Nwa-nwoke, Ha gākpọ kwa aha-Ya Immanuel; nke bu, ma asugharia ya, Chineke nọyere ayi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Lee, nwaagbọghọ ahụ na-amaghị nwoke ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke. Ha ga-akpọ aha ya Ịmanụel” (nke bụ ma asụgharịa ya, “Chineke nọnyeere anyị”).