Matthew 10:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ nye ha ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ. O nyekwara ha ike ịgwọ ọrịa dị iche iche.
Igbo 2006
O we kpọ ndikom iri na abua ahu ndi nēso uzọ-Ya ka ha biakute Ya, O nye ha ike n'ebe ndi-mọ nādighi ọcha nọ, ichupu ha, na igwọ ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ nye ha ikike ịchụpụ mmụọ na-adịghị ọcha, na ịgwọ nrịa nrịa na ọrịa niile dị iche iche.