Matthew 10:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụrụ na ndị nọ nꞌụlọ ahụ anabata unu, meenụ ka ngọzi unu dịkwasị ụlọ ahụ. Ọ bụrụkwanụ na ha anabataghị unu, deberenụ onwe unu ngọzi unu.
Igbo 2006
Ọ buru kwa na ulo ahu kwesiri, ka udo-unu biakwasi ya: ma ọ buru na o kwesighi, ka udo-unu laghachikute unu ọzọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na ndị nọ nʼụlọ ahụ anabata unu, meenụ ka udo unu bịakwasị nʼụlọ ahụ. Ọ bụrụkwanụ na ha anabataghị unu, ka udo unu lọghachikwute unu.