Matthew 10:14 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Obodo ọ bụla ma ọ bụ ụlọ ọ bụla nke jụrụ ịnabata unu, ma ọ bụ ịnụ okwu unu, kụpụsịanụ aja nke obodo ahụ nꞌụkwụ unu mgbe unu na-ahapụ ya.
Igbo 2006
Ma onye ọ bula nke nānaraghi unu nke-ọma, nke nānughi kwa okwu nile unu, mb͕e unu nāpu n'ulo ahu ma-ọbu n'obodo ahu, tichapu ájá ukwu-unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na onye ọbụla anabataghị unu, maọbụ jụ ịnụrụ okwu unu, mgbe unu na-ahapụ ụlọ ahụ maọbụ obodo ahụ kụchapụnụ aja dị nʼụkwụ unu.