Matthew 10:21 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Nwanne ga-agbagide nwanne ya ama, mee ka ọ nwụọ. Ndị bụ nna ga-ararakwa ụmụ ha nye. Ụmụ ga-ebili imegide ndị mụrụ ha, mee ka ha nwụọ.
Igbo 2006
Nwa-nne gārara kwa nwa-nne-ya nye n'ọnwu, nna gārara kwa nwa-ya nye: umu gēbili kwa megide ndi muru ha, me ka ha nwua anwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
“Nwanne ga-arara nwanne ya nye ka e gbuo ya, nna ga-ararakwa nwa ya nye. Ụmụ ga-ebili megide ndị mụrụ ha mee ka e gbuo ha.