Matthew 10:23 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
“Ọ bụrụ na ndị mmadụ esogbuo unu nꞌotu obodo gbaranụ ọsọ gaa nꞌobodo ọzọ. Unu agaghị agazucha obodo ndị a nile tupu m lọghachi.
Igbo 2006
Ma mb͕e ọ bula ha sob͕uru unu n'obodo a, b͕alaga n'obodo di iche: n'ihi na n'ezie asim unu, Unu agaghi-agazù obodo nile nke Israel ma-ọli, rue mb͕e Nwa nke madu gābia.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe ọbụla ndị mmadụ sogburu unu nʼotu obodo gbalaganụ nʼobodo ọzọ. Nʼezie, asị m unu, unu agaghị agazucha obodo niile nke Izrel tupu Nwa nke Mmadụ alọghachi.