Matthew 10:25 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ihe ọ bụla dakwasịrị onye nkuzi na-adakwasị nwanta akwụkwọ ya. Otu a kwa ohu na-eketa oke nꞌihe dakwasịrị nna ya ukwu. Ebe ha kpọrọ m ekwensu, ha ga-enyekwa unu aha ọjọọ karịrị nke a.
Igbo 2006
O zuworo onye nēso uzọ onye-ozizí ka ọ di ka onye-ozizí-ya, na orù ahu ka ọ di ka onye-nwe-ya. Ọ buru na ha kpọrọ Nna-nwe-ulo Beelzebul, hà gēsi aṅa ghara ikpọ ndi èzí-na-ulo-Ya kari nke-uku?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
O zuorela onye na-eso ụzọ onye nkuzi ka ọ dị ka onye nkuzi ya, na ohu ahụ ka ọ dị ka onyenwe ya. Ọ bụrụ na a kpọrọ nna nwe ụlọ Belzebub, a ga-esi aṅaa ghara ịkpọ ndị ezinaụlọ ya ihe karịrị nke a?