Matthew 10:41 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụrụ na unu anabata onye amụma nꞌihi na ọ bụ onye ozi Chineke, unu na onye amụma ahụ ga-enwekọ otu ụgwọ ọrụ. Ọ bụrụkwa na unu anabata ndị ezi omume nꞌihi ezi omume ha, unu ga-esorokwa ha nata ụgwọ ọrụ nke ndị ezi omume.
Igbo 2006
Onye nānara onye-amuma nke-ọma n'aha onye-amuma gānara ugwọ-ọlu onye-amuma; onye nānara kwa onye ezi omume nke-ọma n'aha onye ezi omume gānara ugwọ-ọlu onye ezi omume.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na unu anabata onye amụma nʼihi na ọ bụ onye amụma, unu na onye amụma ahụ ga-enwekọ otu ụgwọ ọrụ. Ọ bụrụkwa na unu anabata onye ezi omume nʼihi ezi omume ya, unu ga-esorokwa ya nata ụgwọ ọrụ nke onye ezi omume.